Monday, 14 January 2013

ONAPUTAWOM, N’ALA APITI by Party Obasi, AGAPE VOL 101 and VOICE OF THE CROSS IN IBO LANGUAGE


ROPUTARA UNU ONWE UNU ONYE UNU GA EFE
Roputara unu onwe unu, onye unu ga n’efe, ma mu n’ezi n’ulo mu, anyi ga efe Chukwu
Anokwala n’obi abua, anokwala n’itu ujo, kpebiere onwe gi taa banyere onye iga efe
Iga akpo isi ala ye arusi, arusi apiri api, olu aka madu, odighi aza ekpere
Jehovah kam ga efe, Oke osis n’enye ndo, ogbara nkiti okwu juru n’onu ya, obunu ya kam ga efe
Okaka nke bi n’igwe, Nmalite n’Ogwugwu, Alpha na Omega obunu ya kam ga efe
Ropurutara unu onwe unu, onye unu ga akpo isiala ye, Paty na ezi n’ulo ya, anyi ga efe Chukwu.

Anokwala n’obi abua, anokwala n’itu ujo, kpebiere onwe gi taa onye iga efe
Iga akpo isi ala ye arusi, arusi apiri api, olu aka madu, odighi aza ekpere
Ma muonwem Jehovah kam ga efe, Oke osis na enye ndo, Ogbara nkiti okwu juru n’onu ya, obunu ya ka anyi ga efe, Okaka nke bi n’igwe, Nmalite n’Ogwugwu, Ogbajiri kpo ya nku, obu ya ka anyi ga efe
Roputara unu onwe unu, onye unu, onye unu ga akpo isiala ye, Gody na ezi n’ulo ya, ha ga efe Chukwu.
Anyi ga efe Chukwu, anyi ga efe Jehovah, Jehovah na eme nma, rue mgbe ebighiebi
Roputara unu onwe unu, onye unu ga n’efe, Okwesco na ezi n’ulo ya, ha ga efe Chukwu.

Anokwala n’obi abua, anokwala n’itu ujo, kpebiere onwe gi taa onye iga efe
Iga akpo isi ala ye arusi, arusi apiri api, olu aka madu, odighi aza ekpere

No comments:

Post a Comment